‘Olee Otú Ọrụ Unu Si Abara Ọha na Eze Uru?’
NKE A bụ ajụjụ Chandrakant Patel, odeakụkọ bụ́ onye India, jụrụ otu onye na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, dị na Brooklyn, New York. Maazị Patel bịara ka e dugharịa ya n’ihe owuwu ahụ, ihe ọ hụrụ na ihe ọ nụrụ masịkwara ya nke ukwuu nke na mgbe ọ laghachiri India, o dere otu isiokwu n’akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’asụsụ Gujarati.
N’iji ụfọdụ nkwenkwe Ndịàmà Jehova tụnyere nke òtù chọọchị dị iche iche dị n’India, Maazi Patel dere na Ndịàmà Jehova kwere na Chineke nke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova, bụ́ nke dị iche n’ozizi Atọ n’Ime Otu a na-akụzikarị na chọọchị dị iche iche nakwa na ha adịghị eji ihe oyiyi efe ofufe. O kwuru na Ndịàmà Jehova nwere ụkpụrụ ndị dị elu n’ihi na ha na-arapagidesi ike n’ụkpụrụ ndị Kraịst e depụtara na Bible banyere ịkwa iko, isikwopụ ime, na mmadụ ịkpọ mmadụ ibe ya asị ma ọ bụ igbu ya. Ọ kọwara Ndịàmà dị ka ndị na-eme udo, na-ahụ n’anya, nwere ogologo ntachi obi, na ndị nwere obi imere ndị ọzọ ihe nakwa ndị na-adịghị atụ egwu, na-anụkwa ọkụ n’obi maka ịgbasara ndị ọzọ ozi Bible.
Gịnị ka a zara odeakụkọ ahụ si India n’ajụjụ ya, bụ́ ‘Olee otú ọrụ unu si abara ọha na eze uru?’ O dere, sị: ‘Azịza ya bụ na mmụta Bible bara uru n’ihe nile a na-eme ná ndụ.’ Maazị Patel chọrọ ịma kpọmkwem banyere nlekọta ahụ ike na ọrụ. N’ihota ụfọdụ n’ime ihe a kọwaara ya, ọ kọrọ, sị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ agbasoo ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ nyere ka e zere ihe ndị na-emerụ ahụ dị ka siga na ọgwụ ọjọọ ma na-ebi ndụ dị ọcha, ọ pụrụ izere ọrịa dị iche iche. Ndị na-arụsi ọrụ ike, na-ebi ndụ dị ọcha, na-akwụwakwa aka ha ọtọ yikarịkwara ka ha ga-enweta ọrụ. Ọzọkwa, idozi esemokwu n’obiọma na n’ịhụnanya na-eme ka e nwee ike isoro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe n’udo. N’ihi ya izi ndị mmadụ ihe Bible kwuru na-abara ọha na eze uru.’
Odeakụkọ a hụrụ ka a na-etinye ozizi Bible n’ọrụ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova. Isiokwu ya toro ịdị ọcha na ihu ọchị nke ndị ọrụ afọ ofufo nọ n’ebe ahụ bụ́ isi nke ọrụ ime mmụọ. Ị pụkwara irite uru n’ozizi Bible. Ọ ga-amasị Ndịàmà Jehova igosi gị otú ị ga-esi rite uru.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]
Akwụkwọ akụkọ e dekwasịrị ihe n’elu ya: Site n’ikike Naya Padkar, bụ́ akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’asụsụ Gujarati n’Anand, India