“Magazin Kachasị Mma”
Ị̀ gụwo magazin Teta! mbụ? Olee otú ị ga-esi kọwaa nke i ji n’aka gị? Ị̀ hụtara isiokwu ndị dị na ya dị ka ndị na-enye ihe ọmụma, ndị e mere nnyocha ha nke ọma, na ndị ihe osise ha dị mma n’anya?
Otu onye edemede nọọrọ onwe ya si Nigeria, Africa, dere, sị: “Abụ m onye na-agụchi Teta! anya, ọ bụ ezie na abụghị m otu n’ime Ndịàmà Jehova. Teta! bụ magazin kachasị mma. Ọ bụ isi iyi nkà nchepụta echiche nye m. Azụ ya nile na-adọrọ adọrọ, na-ewulitekwa n’ime obi onye na-agụ ya nke na-enweghị ajọ mbunobi oké mkpali imepe peji ndị dị na ya. Mbipụta nke ọ bụla na-egosipụta nkà dị ịrịba ama; peji nke ọ bụla na-egosipụtakwa nkà ide akụkọ magburu onwe ya. N’ịbụ nke nwere isiokwu ndị na-abịa n’oge ha na ndị e dere n’ụzọ magburu onwe ha, mbipụta nke ọ bụla nwere ihe ọmụma bara oké uru.”
Anyị na-agba gị ume inyocha isiokwu ndị dị na Teta! nke a. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta ọzọ, biko deta akwụkwọ maka arịrịọ ahụ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5. Ọ ga-amasị anyị izitere gị ọzọ ma ọ bụ, ọ bụrụ na ị rịọ maka ya, mee ndokwa ka mmadụ kpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji soro gị tụlee ihe oge ndị a ndị anyi bi n’ime ha pụtara.