Ili Kraịst Ọ̀ Dị na Japan?
NA 1935, Koma Takeuchi, bụ́ onye nchụàjà Shinto, kpọsara na ya achọpụtawo ili Jisọs Kraịst n’elu ugwu dị n’obodo nta Shingo, n’ebe ugwu Japan. Ọ zọọrọ na ihe ndekọ ndị a chọtara n’otu ụlọ nkwakọba ihe ezinụlọ gosiri na Jisọs biri ruo nwa oge na Shingo ma nwụọ n’ebe ahụ. N’ịchọ ebe e liri Jisọs, ọ hụrụ otu ikpo ájá ma kwubie na ọ bụ ili ya.
Mgbe ahụ, otu ihe ndekọ Hibru nke a kọrọ na a chọtara n’òkwù arụsị ezinụlọ Takeuchi kwuru na Jisọs letara Japan ugboro abụọ na ya na ndị nchụàjà bụ́ ndị Japan mụkọrọ nkà ihe omimi. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu na Jisọs, n’ịbụ onye a raara nye, gbapụrụ site na Judia gaa n’ọzara Siberia, wee gawazie Japan, lụọ otu nwata nwanyị obodo ahụ aha ya bụ Miyuko, mụọ ụmụ nwanyị atọ, ma nwụọ mgbe ọ dị afọ 106. Dị ka akụkọ ifo ahụ si kwuo, nwoke ahụ e gburu na Jerusalem abụghị Jisọs kama nwanne ya nwoke nke nta bụ́ Isukiri.
Gịnị pụrụ ịbụ ihe kpaliri akụkọ dị otú ahụ? Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Mainichi Shimbun si kwuo, njikọ dị n’etiti Jisọs na Shingo “na-atụ aro ohere achụmnta ego nke ndị ọchịchị ógbè ahụ maara nke ọma.” N’ụzọ dị otú a, a gbara ume ilegharị anya. A gbaghị ume ime nnyocha n’ụzọ miri emi. “Ka e were ya na e gwupuru ili ahụ, ha achọpụtakwa nanị ọkpụkpụ ehi meworo ochie,” ka otu onye na-ekiri ihe na-emenụ kwuru. “Cheedị ụdị ndakpọ olileanya ọ ga-abụrụ onye ọ bụla.”
Ya mere kwa afọ na May 3, ndị nleta na-eji obi ha ezukọ n’ihu ihe ahụ e kwuru na ọ bụ ili Jisọs iji mee “Ememe Kraịst.” Onye nchụàjà Shinto na-eduzi ememe ahụ ma na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ tupu ịgba egwú amalite.
È nwere eziokwu ọ bụla dị n’akụkọ ifo a? Ee e. Bible na-akọrọ anyị na ka ọ na-erule afọ 30, a maara Jisọs, ọ bụghị dị ka onye na-eme njem n’ụwa, kama dị ka nwa onye ọkwa nkà bụ́ onye tolitere na Nazaret. Oziọma anọ ahụ nwere ihe ndekọ nke ndị ji anya ha hụ ime nkwusa nke Kraịst n’Israel malite mgbe ọ dị afọ 30 ruo 33. Ha gụnyere ebe na akara ụbọchị ma nwapụta na ọ bụ Jisọs Kraịst n’onwe ya ka e gburu na Jerusalem. N’ihi ya, oké akụkọ ndị na-achọ ịgwagbu eziokwu Bible maka nzube ịchọ ọdịmma onwe onye nanị adịghị akwagharị ezigbo ndị Kraịst.