Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 3/8 p. 10
  • Ndịghachi n’Otu Pụrụ Iche

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndịghachi n’Otu Pụrụ Iche
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị pụrụ inweta ọṅụ n’ime ụwa nke na-akpata obi ịda mbà!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ịmata Ihe Mere Chineke Ji Kwe Ka Nhụjuanya Dịrị Gbanwere Ndụ M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Nzukọ Ndị Na-akpali Ịhụnanya na Ịrụ Ezi Ọrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • O Metụrụ Ya n’Obi
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 3/8 p. 10

Ndịghachi n’Otu Pụrụ Iche

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRITAIN

BRUCE dị afọ abụọ na 1945 mgbe Marie, bụ́ nne ya, hụrụ ya anya ikpeazụ. Ka ịgba alụkwaghịm Marie gasịrị, e nyere nna Bruce ikike nke iwu kwadoro ịkpọrọ ya. N’ịbịada mmetụta ya sitere n’okike, Marie kpebiri na ọ ga-abụ maka ọdịmma kasịnụ nke nwa ya nwoke ka nna ya na nwunye ọhụrụ nna ya zụlite ya n’enweghị mkpaghasị uche site n’aka ya. Ka oge na-aga, ọ hụzighị Bruce anya ma ọlị.

Afọ ụfọdụ mgbe e mesịrị, Marie lụrụ dị ọzọ ma mụta nwa nwoke ọzọ, ma ọ ka na-eche echiche banyere Bruce. Olee ebe ọ nọ? Gịnị meworo ya?

Mgbe nna Bruce nwụrụ na 1976, Marie gara olili ozu ya. Bruce, nwa okorobịa mara mma nọ n’afọ ndị 30 ya ugbu a, nọ ebe ahụ ya na nwunye nna ya. Ebe Marie ka kwere na Bruce chere na nwunye nna ya bụ nne mụrụ ya, o chere na ọ ga-abụ egosighị obiọma ime ka Bruce mara ya, karịsịa n’oge dị otú ahụ. Marie gaara eme ihe dị iche ma a sị na ọ maara na nna Bruce jụrụ ya ngwa ngwa ọ lụsịrị nwunye ọzọ, na ọ bụkwa nne nne ya zụlitere ya.

N’ihe dị ka n’oge a Marie zutere Sue, otu n’ime Ndịàmà Jehova, ma kwere ozugbo inwe ọmụmụ Bible ebe obibi. N’otu oge ahụ, ná ndabakọ, Bruce na nwunye ya malitere iso di Sue, bụ́ Alan, mụwa Bible. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya n’ihi nsogbu ahụ ike, Marie kwụsịrị ọmụmụ ihe ya ma kwapụ.

Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ Marie ọzọ na 1995. Ọ maliteghachiri ọmụmụ Bible ya ọzọ ma nwee ọganihu dị ngwa. Ka oge a ga-eme ya baptism na-eru nso, Marie gwara otu onye Kraịst bụ́ okenye na nzuzo maka Bruce. Okenye ahụ siri imi n’ala wee chọpụta na ọ bụghị nanị na Bruce na ezinụlọ ya bụ Ndịàmà Jehova kama na Bruce bụ okenye n’ọgbakọ dị n’obodo Marie!

Ndị okenye ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ Bruce tụrụ ụjọ. Ọ bụrụ na ha agwa Bruce na a gaje ime nne ya baptism n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na-abịanụ, olee otú ọ ga-esi meghachi omume? Ọ̀ madịịrị na ọ nọ ndụ? Otú ọ dị, ozugbo ihe ọmụma ndị ahụ ruru Bruce ntị, ya na ezinụlọ ya gbagara ịhụ Marie. “Ihe gara aga agaala; ihe dị mkpa n’eziokwu bụ ọdịnihu!” bụ okwu ndị na-akasi obi Bruce kwuru ka ọ makụrụ nne ya.

Na March 1996, e mere Marie, onye gbara afọ 78 mgbe ahụ, baptism n’Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’Ọwụwa Anyanwụ Pennine nke England—site n’aka Bruce. Lee obi ụtọ Bruce nwere inweta nne ya dị ka nwanna nwanyị ime mmụọ!

[Foto dị na peeji nke 10]

Bruce, na nne ya

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya