“Teta! Zọpụtara Ndụ M”
“Ihe dị ka n’elekere 10:00 nke abalị na November 11,” ka Arthur, bi na Suva, Fiji, kọrọ, “Amalitere m inwe obi mgbu, bụ́ nke m lefuuru anya dị ka obi ire ọkụ. O doro nwunye m, bụ́ Esther, anya na m nwere nkụchi obi, ebe o kwuru na mgbaàmà ndị m nwere yiri ndị ahụ a kọwara na Teta! nke December 8, 1996, “Nkụchi Obi—Gịnị Ka A Pụrụ Ime?,” bụ́ nke ọ ka gụpụrụ.
“M gwara dọkịta m okwu na telifon, ọ gwakwara m ka m ṅụọ ọgwụ obi ire ọkụ ụfọdụ, hie ụra, ma bịa hụ ya n’ụtụtụ. Ma, ihe mgbu ahụ dịgidere. Mgbe ahụ m gwara Esther ka o weta Teta! ahụ ma gụọ akụkụ bụ́, “Mgbaàmà nke Nkụchi Obi.” Mgbe ọ gụsịịrị m ya, ekwetara m ka a kpọga m ụlọ ọgwụ.
“Nnyocha gosiri na m na-enwe nkụchi obi, e nyekwara m àkwà n’ụlọ ọgwụ. N’ime ụbọchi ise sochirinụ, e nyere m ọgwụ na-akụjụ ahụ nke ukwuu nakwa ezumike zuru ezu. Ọkachamara ahụ banyere obi sịrị na m nwere ihe ndabara ọma ịchọpụta nkụchi obi m.
“Na January 9, 1997, a wara m ahụ n’obi nke were hour anọ na Sydney, Australia. ‘Ọrịa akwara obi na-ekesa ọbara n’ahụ siri oké ike,’ ka ihe ndekọ dọkịta na-awa ahụ kwuru. Ọdịdị akwara obi m ndị na-ekesa ọbara gosiri na m na-aga inwe ajọ nkụchi obi nke gaara abịa n’ime ọnwa ole na ole ma ọ bụrụ na a chọpụtaghị ọrịa ahụ na November 11.
“Apụrụ m ikwu n’enweghị obi abụọ na Teta! zọpụtara ndụ m, ebe ọ bụ na m gaara elefuru ọrịa m anya dị ka ajọ obi ire ọkụ.”
Teta! na-agbalị inye ihe ọmụma ndị na-abịa n’ezi oge, ndị kasịkwa ọhụrụ n’isiokwu dị iche iche. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịdị na-enweta magazin a mgbe nile, mee ka Ndịàmà Jehova mara n’oge ọzọ ha bịara, ma ọ bụ dega akwụkwọ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5.