Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 1/8 p. 32
  • “Teta! Zọpụtara Ndụ M”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Teta! Zọpụtara Ndụ M”
  • Teta!—1998
Teta!—1998
g98 1/8 p. 32

“Teta! Zọpụtara Ndụ M”

“Ihe dị ka n’elekere 10:00 nke abalị na November 11,” ka Arthur, bi na Suva, Fiji, kọrọ, “Amalitere m inwe obi mgbu, bụ́ nke m lefuuru anya dị ka obi ire ọkụ. O doro nwunye m, bụ́ Esther, anya na m nwere nkụchi obi, ebe o kwuru na mgbaàmà ndị m nwere yiri ndị ahụ a kọwara na Teta! nke December 8, 1996, “Nkụchi Obi—Gịnị Ka A Pụrụ Ime?,” bụ́ nke ọ ka gụpụrụ.

“M gwara dọkịta m okwu na telifon, ọ gwakwara m ka m ṅụọ ọgwụ obi ire ọkụ ụfọdụ, hie ụra, ma bịa hụ ya n’ụtụtụ. Ma, ihe mgbu ahụ dịgidere. Mgbe ahụ m gwara Esther ka o weta Teta! ahụ ma gụọ akụkụ bụ́, “Mgbaàmà nke Nkụchi Obi.” Mgbe ọ gụsịịrị m ya, ekwetara m ka a kpọga m ụlọ ọgwụ.

“Nnyocha gosiri na m na-enwe nkụchi obi, e nyekwara m àkwà n’ụlọ ọgwụ. N’ime ụbọchi ise sochirinụ, e nyere m ọgwụ na-akụjụ ahụ nke ukwuu nakwa ezumike zuru ezu. Ọkachamara ahụ banyere obi sịrị na m nwere ihe ndabara ọma ịchọpụta nkụchi obi m.

“Na January 9, 1997, a wara m ahụ n’obi nke were hour anọ na Sydney, Australia. ‘Ọrịa akwara obi na-ekesa ọbara n’ahụ siri oké ike,’ ka ihe ndekọ dọkịta na-awa ahụ kwuru. Ọdịdị akwara obi m ndị na-ekesa ọbara gosiri na m na-aga inwe ajọ nkụchi obi nke gaara abịa n’ime ọnwa ole na ole ma ọ bụrụ na a chọpụtaghị ọrịa ahụ na November 11.

“Apụrụ m ikwu n’enweghị obi abụọ na Teta! zọpụtara ndụ m, ebe ọ bụ na m gaara elefuru ọrịa m anya dị ka ajọ obi ire ọkụ.”

Teta! na-agbalị inye ihe ọmụma ndị na-abịa n’ezi oge, ndị kasịkwa ọhụrụ n’isiokwu dị iche iche. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịdị na-enweta magazin a mgbe nile, mee ka Ndịàmà Jehova mara n’oge ọzọ ha bịara, ma ọ bụ dega akwụkwọ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya