Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 10/8 p. 31
  • Ònye Bụ Onye Mụrụ Nwa?—Ònye Bụ Nwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Onye Mụrụ Nwa?—Ònye Bụ Nwa?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ, Ọtụtụ Ihe Ịma Aka Ha Na-enwe
    Teta!—2002
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ịzụ Ụmụ n’Ụwa nke Onye Ọ Bụla Na-eme Otú Masịrị Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 10/8 p. 31

Ònye Bụ Onye Mụrụ Nwa?—Ònye Bụ Nwa?

OTU onye ọkà akparamàgwà mmadụ na California, U.S.A., na-akwa arịrị banyere ókè e mebiruworo ịbụisi nke ndị mụrụ ụmụ n’afọ ndị a. “N’ọfịs m,” ka ọ na-ede, “anụwo m nkwurịta okwu a na-apụghị ịgụta ọnụ n’etiti ndị nne na nna na ụmụ ha ndị e kwurịtara dị ka a ga-asị na ọ bụ n’etiti ndị toworo eto abụọ, ọ bụghị nwa na onye mụrụ ya. Nkwekọrịta ndị yiri ụdị a na-enwe n’azụmahịa kasị ukwuu dị iche iche abụrụwo ndị e nwere banyere ihe nile, malite n’oge ịlakpu ụra ruo n’ego mmachi akpa, ruo n’ibu ọrụ ezinụlọ. Oge ụfọdụ, o siwo ike ịmata onye bụ onye mụrụ nwa na onye bụ nwa.”

Bible na-enye ndụmọdụ guzoziri eguzozi maka ndị mụrụ ụmụ. Ọ na-adọ ha aka ná ntị banyere ihe ize ndụ nke ịdị aka ike gabiga ókè nke na ha na-akpasu nwa ha iwe, ikekwe na-eme ka nwa ahụ daa mbà n’obi, bụrụkwa onye obi furu. (Ndị Kọlọsi 3:21) Ma ọ na-adọkwa ndị mụrụ ụmụ aka ná ntị banyere akụkụ ọzọ gabigara ókè—ịnakwere nnọọ ihe ọ bụla, na-agbahapụ ịbụisi ha. Ilu 29:15 na-ekwu, sị: “Nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” Ilu ọzọ nke Bible na-ekwu, sị: “Onye zụtọworo ohu ya site na nwata, n’ikpeazụ ya ohu ahụ ga-aghọkwa [onye na-enweghị ekele, NW].” (Ilu 29:21) Ọ bụ ezie na akụkụ akwụkwọ nsọ a na-ezo aka n’ebe ohu nọ, n’ụzọ kwekọrọ na ya, ụkpụrụ ahụ metụtakwara ụmụaka.

Ndị nne na nna na-anapụ ụmụ ha nduzi na ọzụzụ dị mkpa na-emesịa kwụọ ụgwọ dị ukwuu—ezinụlọ na-enweghị nchịkwa. Lee ka o si ka mma itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ! N’eziokwu, ime nke a chọrọ mgbalị, ma ọ pụrụ iweta abamuru na-adịgide adịgide. Bible na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”—Ilu 22:6.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya