Ònye Bụ Onye Mụrụ Nwa?—Ònye Bụ Nwa?
OTU onye ọkà akparamàgwà mmadụ na California, U.S.A., na-akwa arịrị banyere ókè e mebiruworo ịbụisi nke ndị mụrụ ụmụ n’afọ ndị a. “N’ọfịs m,” ka ọ na-ede, “anụwo m nkwurịta okwu a na-apụghị ịgụta ọnụ n’etiti ndị nne na nna na ụmụ ha ndị e kwurịtara dị ka a ga-asị na ọ bụ n’etiti ndị toworo eto abụọ, ọ bụghị nwa na onye mụrụ ya. Nkwekọrịta ndị yiri ụdị a na-enwe n’azụmahịa kasị ukwuu dị iche iche abụrụwo ndị e nwere banyere ihe nile, malite n’oge ịlakpu ụra ruo n’ego mmachi akpa, ruo n’ibu ọrụ ezinụlọ. Oge ụfọdụ, o siwo ike ịmata onye bụ onye mụrụ nwa na onye bụ nwa.”
Bible na-enye ndụmọdụ guzoziri eguzozi maka ndị mụrụ ụmụ. Ọ na-adọ ha aka ná ntị banyere ihe ize ndụ nke ịdị aka ike gabiga ókè nke na ha na-akpasu nwa ha iwe, ikekwe na-eme ka nwa ahụ daa mbà n’obi, bụrụkwa onye obi furu. (Ndị Kọlọsi 3:21) Ma ọ na-adọkwa ndị mụrụ ụmụ aka ná ntị banyere akụkụ ọzọ gabigara ókè—ịnakwere nnọọ ihe ọ bụla, na-agbahapụ ịbụisi ha. Ilu 29:15 na-ekwu, sị: “Nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” Ilu ọzọ nke Bible na-ekwu, sị: “Onye zụtọworo ohu ya site na nwata, n’ikpeazụ ya ohu ahụ ga-aghọkwa [onye na-enweghị ekele, NW].” (Ilu 29:21) Ọ bụ ezie na akụkụ akwụkwọ nsọ a na-ezo aka n’ebe ohu nọ, n’ụzọ kwekọrọ na ya, ụkpụrụ ahụ metụtakwara ụmụaka.
Ndị nne na nna na-anapụ ụmụ ha nduzi na ọzụzụ dị mkpa na-emesịa kwụọ ụgwọ dị ukwuu—ezinụlọ na-enweghị nchịkwa. Lee ka o si ka mma itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ! N’eziokwu, ime nke a chọrọ mgbalị, ma ọ pụrụ iweta abamuru na-adịgide adịgide. Bible na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”—Ilu 22:6.