Amamihe nke Ịhapụ Inwe Mmekọahụ na Ịlụ Otu Onye
RUO taa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ 30 ebutewo nje ọrịa AIDS, ihe karịkwara nde mmadụ 6 anwụọla. Kwa ụbọchị a na-achọpụta ihe dị ka mmadụ 8,500 ndị ọhụrụ bu ya—nke 1,400 n’ime ha bụ ụmụaka, bụ́ ndị na-anwụkarị n’ime afọ mbụ nke ndụ ha. Mkpọsa nke ihe a sị na ọ bụ mmekọahụ na-adịghị ize ndụ akpaliwo mmasị ọha na eze, ma ụfọdụ na-eche na nke a ezughị. “AIDS bụ ọrịa na-egbu egbu,” ka Dr. Steven J. Sainsbury dere na The Tampa Tribune, “ihe ọ bụlakwa e mere iji gbochie nkesa ya aghaghị ịdị irè 100 pasent.”
Banyere iji condom eme ihe dị ka ụzọ isi gbochie ọrịa AIDS, Dr. Sainsbury na-ekwu, sị: “Si otú a lee ya anya. Ka e were ya na, n’ihi ihe ndị a na-amaghị, ụgbọala amalite ịgbawa na mberede mgbe ọ bụla mmadụ sikere ya. Ndị na-anya ụgbọala na-anwụ n’akụkụ nile nke mba ahụ. N’ikpeazụ, gọọmenti ewepụta otu ihe ngwọta. Nanị tinye otu ihe ntinye a n’ime mmanụ ụgbọala, ka ha kwuru, ihe ize ndụ nke mgbawa ahụ ga-ebelata ruo 90 pasent. Ị̀ ga-ewere ya na a gwọtala nsogbu ahụ? Ị̀ ka ga na-anya ụgbọala gị? Echeghị m. Mgbe ahụ gịnị mere anyị ji anakwere condom dị ka ihe ngwọta maka ọrịa AIDS?”
N’ịmata na ihe kasị akpata ọrịa AIDS bụ inwe mmekọahụ, Dr. Sainsbury na-enye otu ihe ngwọta: “Enwela mmekọahụ ruo mgbe mmadụ dị njikere ikweta iso otu onye na-ebughị ya nwee mmekọrịta. Okwu ndị bụ isi bụ ịhapụ inwe mmekọahụ na ịlụ otu onye.”
Bible na-enye ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye iwu ịghara inwe mmekọahụ na ịlụ otu onye maka ndị nwere di ma ọ bụ nwunye. Ụkpụrụ ndị dị elu nke Bible machibidoro ịkwa iko nile na ndina ụdị onwe. (Matiu 19:4-6; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 7:8, 9) Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-akatọ ụkpụrụ a, na-ekwu na oge ya agafeela, ụkpụrụ omume ọma nke Bible akwalitewo ahụ ike na udo nke uche.—Aịsaịa 48:17.