Ọ̀ Dịwo Mgbe Ị Hụrụ Mgbukepụ Akwụkwọ Ndụ Akwụkwọ Ndụ?
LEE ka o si enye obi ụtọ ịgwa ụbọchị ọzọ ka e mesịa site n’ikiri anyanwụ na-ada ada nke mara mma! Ìhè dị ṅaraṅara nke anyanwụ na-ewepụta àgwà ndị mara mma mgbe ìhè si na mbara ụwa na-agafe. Ihe ijuanya a na-adịghị ahụkebe nke a na-akpọ mgbukepụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ na-ewepụta nke a. Ọ bụrụ na e nwere ọnọdụ ndị kwesịrị ekwesị, nnwupụta a nke ìhè emerald na-ewere ọnọdụ n’oge ikpeazụ nke mgbe anyanwụ na-ada. A na-ekwu na ihe omume dị ụkọ karị a na-akpọ mgbukepụ anụnụ anụnụ mara mma ọbụna karị.
Gịnị na-akpata mgbukepụ ndị a mara mma? Gịnị mere ha ji adịru nanị otu ntabi anya? N’ihi gịnịkwa ka ha ji adị ụkọ otú a? Iji zaa ajụjụ ndị a, anyị aghaghị ibu ụzọ nwee nghọta bụ isi banyere mmetụta ìhè anyanwụ na mbara ala na-enwe n’ebe ibe ha dị.
Ìhè anyanwụ si n’elu na-achakwasị ụwa nwere àgwà nile nke eke na ogwurugwu. Mgbe ìhè a wakwasịrị mbara ala, mbara ikuku na-arụ ọrụ dị ka nnukwu prism ma na-agbasasị, ma ọ bụ na-ekesasị, ìhè ahụ. Otú ọ dị, ókè a na-ekesasị ụzarị nke ìhè na-adabere n’agbata ụzarị nke ìhè ya.
Ụzarị nke ìhè anụnụ anụnụ nwere agbata ụzarị nke ìhè ka mkpụmkpụ, a na-agbasakwa ha n’ụzọ sara mbara karị na mbara ikuku nile. Ọ bụ nke ahụ mere mbara igwe ji adị ka ọ na-acha anụnụ anụnụ mgbe anyanwụ dị nnọọ n’elu mbara ụwa n’ụbọchị gbachapụrụ agbachapụ. Ma mgbe anyanwụ dị nso n’ebe mbara ụwa na igwe zutere—dị ka n’oge anyanwụ na-ada—ìhè anyanwụ aghaghị isi n’akụkụ ka ukwuu nke mbara ikuku gafere iji ruo n’anya anyị. N’ihi ya, ìhè anụnụ anụnụ ahụ gbasasịrị nke ukwuu adịghị erute anyị. N’aka nke ọzọ, ụzarị nke ìhè ndị dị ogologo karị, dị ka nke na-acha uhie uhie, pụrụ ịbanye n’ụzọ dị mfe na mbara ikuku ahụ jikọtara ọnụ. Nke a na-enye anyanwụ na-ada ada àgwà ya a ma ama bụ́ uhie uhie ma ọ bụ edo edo.a
Otú ọ dị, n’okpuru ọnọdụ ụfọdụ, a pụrụ ịhụ mgbukepụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ mgbukepụ anụnụ anụnụ mgbe anyanwụ na-ada. Olee otú ndị a si eme? Ka akụkụ ikpeazụ nke anyanwụ na-abami n’okpuru ebe mbara ụwa na igwe zutere, ìhè anyanwụ na-ekewa ịghọ ụdị dị iche iche nke ụzarị nke ìhè dị ka eke na ogwurugwu. Ìhè uhie uhie na-apụta n’okpuru ụdị dị iche iche nke ụzarị nke ìhè ahụ, ìhè anụnụ anụnụ na-adịkwa n’elu. Ka anyanwụ ahụ nọgidere na-ada, akụkụ uhie uhie nke ụdị dị iche iche nke ụzarị nke ìhè ahụ na-ada n’okpuru ebe mbara ụwa na igwe zutere, mbara ikuku na-agbasakarịkwa akụkụ anụnụ anụnụ ahụ. Ọ bụ nnọọ n’oge a ka akụkụ ikpeazụ nke ìhè a na-ahụ anya pụrụ igbukepụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Gịnị mere o ji acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ? N’ihi na akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ bụ àgwà bụ isi nke ìhè.
Mgbe e metọrọ igwe n’ụzọ dị ukwuu, ọ na-esi ike ịhụ mgbukepụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ahụ, mgbukepụ anụnụ anụnụ ahụ na-apụtakwa nanị mgbe mbara ikuku gbachapụrụ agbachapụ n’ụzọ pụrụ iche, ìhè anụnụ anụnụ na-abanyekwa n’igwe iji mee ka mgbukepụ na-enwu enwu pụta.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Teta! (Bekee) nke December 8, 1987, peji nke 16, maka ihe ọmụma ka ukwuu n’anyanwụ na-ada ada.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]
Anyanwụ na-ada ada: ©Pekka Parviainen/SPL/Photo Researchers