MAỊKA
1 Ihe a ka Jehova gwara Maịka*+ onye Moreshet, n’oge Jotam,+ Ehaz,+ na Hezekaya+ bụ ndị eze Juda.+ Ọ gwara ya ihe a n’ọhụụ gbasara Sameria na Jeruselem:
2 “Unu niile, geenụ ntị.
Ụwa na ihe jupụtara na ya, ṅaanụ ntị.
Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.
Nụrụnụ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-ekwu ihe unu mere.+
3 N’ihi na Jehova si n’ebe o bi na-apụta.
Ọ ga-agbadata wee zọda ebe ndị dị elu n’ụwa.
4 Ugwu niile ga-agbaze n’okpuru ụkwụ ya.+
Ole ndị mere Jekọb ji nupụ isi?
Ọ́ bụghị ndị bi na Sameria?+
Ole ndị mekwara e ji nwee ebe ndị dị elu na Juda?+
Ọ́ bụghị ndị bi na Jeruselem?
6 M ga-eme ka Sameria bụrụzie obodo e bibiri ebibi nke dị n’ọhịa,
Ebe a na-akọ ubi vaịn.
M ga-awụba nkume ya na ndagwurugwu.
M ga-akụrikwa ntọala ya.
M ga-ebibi arụsị ya niile.
N’ihi na o ji ihe ọ gbatara n’akwụna nweta ha.
A ga-ejikwa ha kwụọ ndị akwụna nọ ebe ọzọ ụgwọ.”
8 M ga-ebe ákwá arịrị, tiekwa mkpu ákwá n’ihi ihe a.+
M ga-agba ụkwụ efu, gbarakwa ọtọ na-ejegharị.+
M ga na-eti mkpu dị ka nkịta ọhịa,
Na-erukwa uju dị ka enyí nnụnụ.
9 N’ihi na ọnyá ya enweghị ike ịla ala.+
Ọnyá ahụ erutela Juda.+
O rutela n’ọnụ ụzọ ámá ndị m, rutekwa Jeruselem.+
10 “Unu akọla ya na Gat.
Unu ebela ákwá.
Tụrụọnụ n’ájá na Bet-afra.*
11 Ndị bi na Shefia, gbaranụ ọtọ jiri ihere si n’ala unu pụọ.
Ndị bi na Zeanan apụtabeghị.
Ndị Bet-izel ga na-eti mkpu arịrị. Ha agaghịzi enyere unu aka.
12 Ndị bi na Merọt na-eche ka ha nweta ihe ọma.
Ma, Jehova emeela ka ihe ọjọọ bịa n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.
13 Ndị bi na Lekish,+ kegidenụ ịnyịnya n’ụgbọ ịnyịnya.
Mmehie Zayọn mere si unu n’aka,
N’ihi na ọ bụ unu mere ka Izrel nupụ isi.+
14 N’ihi ya, unu ga-enye Moreshet-gat onyinye ọ ga-eji ala.
Ụlọ ndị dị n’Akzib+ rafuru ndị eze Izrel.
15 Ndị bi na Marisha,+ m ga-ezitere unu onye ga-emeri unu.*+
Ebube Izrel ga-eru Adọlam.+
16 Meenụ onwe unu isi nkwọcha ma kpụchapụ ntutu isi unu n’ihi ụmụ unu unu hụrụ n’anya.
Meenụ ka isi nkwọcha unu dị ka nke udele,
N’ihi na e si ebe unu nọ dọrọ ụmụ unu n’agha.”+
2 “Ndị na-akpa nkata ihe ọjọọ,
Ndị na-edina n’àkwà* ha eme atụmatụ otú ha ga-esi mee ihe na-adịghị mma, ga-ata ahụhụ.
Ha na-eme ihe ahụ ha kpara nkata ya mgbe chi bọrọ,
N’ihi na ha ga-emeli ya.+
2 Ha chọọ inweta ubi, ha anara ya n’ike.+
Ha chọọ inweta ụlọ, ha eweghara ya.
Ha na-egwu mmadụ wayo nara ya ụlọ ya.+
Ha na-egwukwa mmadụ wayo nara ya ala ya.
3 N’ihi ya, Jehova kwuru, sị:
‘M na-eme atụmatụ ka ọdachi dakwasị unu,+ ọdachi nke unu na-agaghị agbanahụ.*+
Unu agaghịzi adị mpako,+ n’ihi na ọ bụ oge ọdachi.+
4 N’ụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-eji unu na-atụ ilu.
Ha ga-ebekwara unu ákwá arịrị.+
Ha ga-asị: “A laala anyị n’iyi.+
O nyere ndị ọzọ ala anyị ketara. Ọ napụla anyị ya.+
O nyere onye na-anaghị efe Chineke ubi anyị.”
5 N’ihi ya, unu agaghị enwe onye ga-eji ụdọ na-atụ̀ ala,
Onye ga-ekere ọgbakọ Jehova ala.
6 Ha na-asị, “Unu ekwusala ihe ọ bụla.
E kwesịghị ikwusa ihe ndị a.
A gaghị emenye anyị ihere.”
7 Ndị si n’ezinụlọ Jekọb, ndị mmadụ hà na-ajụ, sị:
“Jehova ọ́ naghịzi enwe ndidi?*
Ọ̀ bụ ya mere ihe ndị a?”
Okwu m ọ́ naghị eme ka ihe gaziere ndị na-eme ihe ziri ezi?
8 Ma n’oge na-adịbeghị anya, ndị m na-emezi ka ndị iro.
Ọ na-abụ, ha hụ ndị tụsaara ahụ́ na-agafe ka ndị si agha na-alọta,
Ha eyipụ ha ihe ndị dị oké ọnụ* e ji chọọ uwe ha mma.
9 Ha na-achụpụ ụmụ nwaanyị ndị m n’ụlọ ha na-enwe obi ụtọ na ya.
Ha na-anapụ ụmụ ha ihe ndị m ji gọzie ha. Ha anaghịkwa enyeghachi ha ihe ndị ahụ ọzọ.
10 Bilienụ pụọ, maka na ebe a abụghị ebe a na-ezu ike.
N’ihi na ala a adịghị ọcha.+ E bibiela ya ezigbo mbibi.+
11 Ọ bụrụ na onye na-achụ ikuku, nke na-aghọkwa aghụghọ, aghaa ụgha, sị:
“M ga-agwa unu okwu banyere mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ na-aba n’anya,”
Ọ bụ ụdị onye a ka ndị a na-achọ ka ọ na-agwa ha okwu.+
12 Jekọb, m ga-akpọkọta unu niile.
O nweghị ihe ga-eme ka m ghara ịkpọkọta ndị Izrel fọdụrụnụ.+
M ga-eme ka ha dịrị n’otu dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ,
Dị ka ìgwè anụ nke nọ ebe ha na-ata ahịhịa.+
Ìgwè mmadụ ga na-eme mkpọtụ ebe ahụ.’+
13 Onye na-etipu mgbidi ga-ebutere ha ụzọ.
Ha ga-etipukwu mgbidi. Ha ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá gafere, sikwa na ya pụọ.+
Eze ha ga-ebutere ha ụzọ,
Jehova ga-abụkwa onyeisi ha.”+
Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịma ihe ziri ezi?
2 Ma, unu kpọrọ ihe ọma asị,+ hụ ihe ọjọọ n’anya.+
Unu na-agba ndị m akpụkpọ, na-adọpụsịkwa anụ dị n’ọkpụkpụ ha.+
Na-agbakwa ha akpụkpọ,
Kụrie ọkpụkpụ ha, gwerisiekwa ha+
Dị ka ihe e ji ite* sie, dịkwa ka anụ dị n’ime ite e ji esi nri.
4 N’oge ahụ, ha ga-akpọku Jehova ka o nyere ha aka,
Ma ọ gaghị aza ha.
Ọ ga-agbakụta ha azụ n’oge ahụ+
N’ihi ihe ọjọọ ndị ha na-eme.+
5 Ndị amụma na-eme ka ndị m kpafuo.+ Ọ na-abụ ha nwee ihe ezé ha ga-ata,+ ha asị, ‘Udo dịrị unu.’+
Ma ọ bụrụ na mmadụ etinyeghị ihe n’ọnụ ha, ha alụso onye ahụ ọgụ.
N’ihi ya, Jehova gwara ndị amụma ahụ, sị:
6 ‘Chi ga-ejinahụ unu.+ Unu agaghị ahụ ọhụụ.+
Naanị ọchịchịrị ka unu ga-ahụ. Unu agaghịzi agba afa.
Anyanwụ ga-ada n’ihi ndị amụma,
Chi ga-ejibidokwa ha.+
Ha niile ga-ekpuchi ọnụ ha,*
N’ihi na Chineke azaghị ha ihe ọ bụla.’”
8 Ma mmụọ Jehova emeela ka ezigbo ike dịrị n’ime m.
Ọ na-enyekwara m aka ka m na-ekpe ikpe ziri ezi, na-akatakwa obi,
Iji gwa Jekọb isi o nupụrụ, gwakwa Izrel mmehie ya.
9 Biko nụrụnụ ihe a, ndị isi n’ezinụlọ Jekọb,
Na ndị na-achị ndị Izrel,+
Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ndị na-agbagọkwa ihe ọ bụla kwụ ọtọ,+
10 Ndị na-eji igbu mmadụ* arụ Zayọn, na-ejikwa ajọ omume arụ+ Jeruselem.
11 Ndị ndú* ya anaghị ekpe ikpe n’anaraghị aka azụ.*+
Ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ.+
Ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego.*+
Ma ha tụkwasịrị Jehova obi,* na-asị:
“Ọ̀ bụ na Jehova anọnyereghị anyị?+
Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+
12 N’ihi ya, a ga-eji maka unu
Kọọ Zayọn ka ubi.
Jeruselem ga-abụzi obodo e bibiri ebibi.+
Oké ọhịa ga-etochikwa ugwu nke ụlọ nsọ dị n’elu ya.+
A ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile.
Ndị dị iche iche ga-enurukwa na-agbago na ya.+
2 Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị:
“Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova,
Gbagookwa n’ụlọ Chineke Jekọb.+
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya.
Anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”
N’ihi na a ga-esi na Zayọn nye iwu,*
Sikwa na Jeruselem kwuo ihe Jehova kwuru.
Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,
Kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi.+
Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha.
Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.+
4 Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya.+
5 N’ihi na ndị dị iche iche ga na-aza aha* chi ha.
Ma, anyịnwa ga na-aza aha* Jehova bụ́ Chineke anyị+ ruo mgbe niile ebighị ebi.
6 Jehova kwuru, sị: “N’ụbọchị ahụ,
M ga-achịkọta ndị na-ete ụkwụ.
M ga-akpọkọta ndị a chụsasịrị achụsasị,+
Kpọkọtakwa ndị m mesiri ike.
Mụnwa bụ́ Jehova ga-esikwa n’Ugwu Zayọn na-achị ha,
Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
8 Ma gịnwa, ụlọ nche nke ndị na-azụ atụrụ,
Ugwu Zayọn,+
Ị ga-amaliteghachi ịchị n’alaeze mbụ,+
Alaeze nke dịbu na Jeruselem.+
9 Gịnịzi mere i ji na-etisi mkpu ike?
Ọ̀ bụ na i nweghị eze,
Ka ọ̀ bụ na onye ndụmọdụ gị anwụọla,
Nke mere ahụ́ ji na-afụ gị ụfụ dị ka nwaanyị ime na-eme?+
10 Ndị bi na Zayọn, ahụ́ ga-afụ unu ụfụ, unu ga-etikwa mkpu ákwá
Dị ka nwaanyị ime na-eme,
N’ihi na unu ga-esi n’obodo pụọ gaa biri n’ọhịa.
Unu ga-erukwa Babịlọn.+
Ọ bụ ebe ahụ ka a ga-anapụta unu.+
Ọ bụ ebe ahụ ka Jehova ga-agbapụta unu n’aka ndị iro unu.+
11 A ga-achịkọta ọtụtụ mba ịlụso unu agha,
Ha ga-asị, ‘Ka e merụọ Zayọn,
Ka anya anyị hụkwa mgbe ihe a ga-eme ya.’
12 Ma, ha amaghị uche Jehova.
Ha aghọtaghịkwa nzube ya.
N’ihi na ọ ga-achịkọta ha dị ka ùkwù ọka* a ka gbutere egbute, nke e bu na-aga n’ebe a na-azọcha ọka.
M ga-agbanwekwa ọbụ ụkwụ unu ka ọ bụrụ ọla kọpa.
Unu ga-egwerikwa ọtụtụ ndị.+
Unu ga-enye Jehova uru ha ji aghụghọ rite,
Nyekwa Onyenwe ụwa niile akụ̀ ha.”+
5 “Ugbu a, unu ndị bi n’obodo a nọchibidoro anọchibido,
Unu na-ebekasị onwe unu ahụ́.
A nọchibidola anyị.+
Ha ga-akụ onyeikpe Izrel mkpara na ntì.+
Ọ bụ na gị ka onye m ga-eme eze Izrel ga-esi pụta,+
Onye dịwara kemgbe oge ochie, kemgbe ọtụtụ afọ.
3 N’ihi ya, Chineke ga-enyefe ha n’aka ndị iro ha
Ruo mgbe nwaanyị ime na-eme ga-amụ nwa.
Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị fọdụrụ ga-alọghachikwute ndị Izrel.
4 Ọ ga-ebili ma jiri ike Jehova zụọ ha ka atụrụ,+
Jirikwa ebube nke aha Jehova bụ́ Chineke ya zụọ ha.
Ha ga-ebi ebe ahụ, ahụ́ eruokwa ha ala.+
Ọ ga-abụ onye ukwu n’ebe niile n’ụwa.+
Ọ bụrụ na onye Asiria abata n’ala anyị zọda ụlọ elu anyị,+
Anyị ga-esi n’ụmụ mmadụ họpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi* asatọ ga-alụso ya ọgụ.
Onye Asiria+ ahụ bata n’ala anyị ma zọọ ụkwụ na ya ịlụso anyị ọgụ,
Onye na-achị anyị ga-anapụta anyị n’aka ya.
7 N’anya ọtụtụ ndị, ndị fọdụrụ n’ezinụlọ Jekọb
Ga-adị ka igirigi nke si n’ebe Jehova nọ.
Ha ga-adịkwa ka mmiri nke na-ezo n’elu ahịhịa,
Nke na-anaghị eche ka mmadụ gwa ya ihe ọ ga-eme,
Nke na-anaghịkwa echere ụmụ mmadụ.
8 N’anya mba dị iche iche
Nakwa n’anya ọtụtụ ndị, ndị fọdụrụ n’ezinụlọ Jekọb
Ga-adị ka ọdụm nke nọ ebe anụ ọhịa ndị ọzọ nọ.
Ha ga-adịkwa ka ọdụm nọ ebe ìgwè atụrụ nọ,
Nke ọ na-abụ ọ na-agafe, ya ana-azọpịa ma na-adọri anụ ndị ọzọ.
E nweghịkwa onye na-anapụta ha.
9 Unu ga-emeri ndị iro unu.
A ga-ebibikwa ndị iro unu niile.”
10 Jehova kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ,
M ga-ebibi ịnyịnya unu na ụgbọ ịnyịnya unu.
11 M ga-ebibi obodo ndị dị n’ala unu,
Kwatuokwa ebe niile unu rụsiri ike.
13 M ga-ebibi arụsị unu a pịrị apị na ogidi unu.
Unu agaghịzi akpọrọ ihe unu ji aka unu rụọ isiala.+
15 M ga-eji iwe na ọnụma kwụọ
Mba ndị na-erubereghị m isi ụgwọ.”
6 Biko, nụrụnụ ihe Jehova na-ekwu.
Bilienụ, zaranụ ọnụ unu n’ihu ugwu ukwu niile,
Ka ugwu nta niile nụkwa olu unu.+
2 Ugwu niile, nụrụnụ ihe Jehova kwuru na e mere ya.
Ntọala ụwa nke siri ike, nụrụkwanụ,+
N’ihi na Jehova na ndị ya nwere okwu.
Nụrụnụ ihe ọ sị na ndị Izrel mere ya:+
3 “Ndị m, gịnị ka m mere unu?
Oleekwa otú m si mee ka ike m gwụ unu?+
Kwuonụ ihe m mere unu.
Agbapụtara m unu n’ala unu bụ ndị ohu.+
Eziteere m unu Mosis, Erọn, na Miriam.+
6 Olee ihe m ga-eji bịa n’ihu Jehova?
Olee ihe m ga-eji kpọọrọ Chineke nọ n’elu isiala?
M̀ ga-eji àjà a na-esucha ọkụ bịa n’ihu ya?
M̀ ga-eji ụmụ ehi gbara otu afọ bịa n’ihu ya?+
7 Puku kwuru puku ebule ọ̀ ga-adị Jehova mma?
Mmanụ nke na-asọ ka iri puku kwuru iri puku iyi ọ̀ ga-adị ya mma?+
M̀ ga-enye ọkpara m maka isi m nupụrụ?
M̀ ga-enye mkpụrụ nke afọ m maka mmehie m?*+
8 Gịnwa bụ́ mmadụ, Jehova agwala gị ihe dị mma.
Gịnịkwa ka ọ na-achọ n’aka gị?
9 Olu Jehova na-akpọ obodo òkù.
Ndị nwere ezigbo amamihe ga-atụkwa egwu aha ya.
Nụrụnụ ihe mkpanaka na onye họpụtara ya na-ekwu.+
10 È nwere akụ̀ a kpatara otú na-adịghị mma
Ma ọ bụ efa* na-ezughị ezu, nke rụrụ arụ, ka dị n’ụlọ onye ajọ omume?
11 Aka m ọ̀ dị ọcha ma m nwee ihe na-adịghị mma e ji atụ̀ ihe
Na akpa nkume e ji atụ̀ ihe, nke e ji egwu wayo?+
12 N’ihi na ndị ya bara ọgaranya bụ ndị tigbuo zọgbuo.
Ndị bi n’obodo a na-aghakwa ụgha.+
Ire ha bụ aghụghọ aghụghọ.+
13 “N’ihi ya, m ga-eti gị ihe, merụọkwa gị ahụ́.+
M ga-eme ka ị tọgbọrọ chakoo n’ihi mmehie gị.
14 Ị ga-eri ihe ma afọ agaghị eju gị.
O nweghị ihe ga-adị gị n’afọ.+
O nweghị ebe ị ga-ebusa ngwongwo ị kwapụtara, ndị ọzọ aghara iburu ya.
M ga-enyefe ndị iro gị ngwongwo ị kwapụtara.
15 Ị ga-akụ mkpụrụ, ma ị gaghị aghọrọ ya.
Ị ga-azọcha mkpụrụ oliv, ma ị gaghị ete mmanụ ya.
Ị ga-emepụta mmanya ọhụrụ, ma ị gaghị aṅụ mmanya.+
16 N’ihi na unu na-eme ihe niile Ọmraị na ezinụlọ Ehab mere.+
Unu na-akpakwa àgwà otú ha kpara.
Ọ bụ ya mere m ga-eji mee obodo a ihe ọ ga-abụ, ndị mmadụ hụ ya, ya eju ha anya.
Ndị bi n’obodo a ga-abụkwa ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị.+
Ndị dị iche iche ga-akọchakwa ha.”+
7 Nke m agwụla. Adị m ka onye
Ghọrọ mkpụrụ osisi n’oge ọkọchị
Ma tụtụkọta mkpụrụ vaịn fọrọnụ mgbe e wechara ihe ubi,
Ma ọ hụghị ụyọkọ mkpụrụ vaịn ọ ga-aracha.
Ọ hụghịkwa mkpụrụ fig mbụ na-agụ ya agụụ.*
2 Ezigbo mmadụ anọghịzi n’ụwa.
O nweghịkwa mmadụ ọ bụla na-eme ihe dị mma.+
Ha niile na-ezo ka ha gbuo mmadụ.*+
Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.
3 Aka ha ma nnọọ otú e si eme ihe ọjọọ.+
Onyeisi na-ekwu ihe a ga-enye ya.
Onye na-ekpe ikpe na-ekwu ka a kwụọ ya ụgwọ.+
Onye a ma ama na-ekwukwa ihe ọ chọrọ ka e nye ya.*+
Ha na-agbakọkwa aka eme ya.
4 Onye kacha mma n’ime ha yiri ogwu.
Onye kacha ha eme ihe dị mma dị njọ karịa ahịhịa ogwu e ji gbaa ogige.
Ụbọchị ndị nche gị kwuru gbasara ya, nke bụ́ ụbọchị a ga-ekpe gị ikpe, ga-eru.+
Ha agaghịkwa ama ihe ha ga-eme eme.+
5 Unu atụkwasịla enyi unu obi.
Unu atụkwasịkwala enyi ọma unu obi.+
Agwala onye dina gị n’akụkụ ihe ị na-ezo ezo,
6 N’ihi na nwa nwoke na-eleda nna ya anya.
Nwa nwaanyị na-emegide nne ya.+
Nwunye nwa na-emegidekwa nne di ya.+
Ndị ezinụlọ mmadụ bụ ndị iro ya.+
7 Ma mụnwa ga na-ele anya Jehova.+
M ga-echere* Chineke, onye nzọpụta m.+
Chineke m ga-anụ olu m.+
8 Onye iro m, aṅụrịla ọṅụ n’ihi ihe mere m.
Ọ bụ eziokwu na adaala m, m ga-ebili.
Ọ bụ eziokwu na m bi n’ọchịchịrị, Jehova ga-abụrụ m ìhè.
9 M ga-edi iwe Jehova na-ewesa m
N’ihi na emehiela m ya.+
M ga na-edi ya ruo mgbe o kpechitere ọnụ m, kpeekwara m ikpe ziri ezi.
Ọ ga-akpọrọ m bịa n’ìhè.
M ga-elekwasị ezi omume ya anya.
10 Onye iro m ga-ahụ ya.
Ihere ga-emegbukwa onye jụrụ m, sị:
“Olee ebe Jehova Chineke gị nọ?”+
M ga na-ele onye iro m anya.
A ga na-azọ ya ụkwụ otú e si azọ apịtị dị n’okporo ámá.
11 Ọ ga-abụ ụbọchị a ga-eji nkume rụọ mgbidi gị.
N’ụbọchị ahụ, ị ga-enwekwu ala.
12 N’ụbọchị ahụ, ha ga-esi
N’Asiria na obodo ndị dị n’Ijipt bịakwute gị.
Ha ga-esi n’Ijipt ruo n’Osimiri Yufretis.
Ha ga-esi n’otu oké osimiri ruo n’oké osimiri ọzọ, sikwa n’otu ugwu ruo n’ugwu ọzọ.+
13 Ala a ga-aghọ ebe tọgbọ nkịtị n’ihi ndị bi na ya,
N’ihi ihe ha metara.*
14 Jiri mkpara gị zụọ ndị gị, bụ́ ìgwè atụrụ i ketara,+
Ndị naanị ha bi n’oké ọhịa, n’ebe a kụrụ mkpụrụ osisi dị iche iche.
Ka ha taa ahịhịa n’ala Beshan na Gilied+ otú ha tara n’oge ochie.
15 “M ga-egosi unu ihe ndị dị ebube+
Otú m gosiri unu n’ụbọchị unu si n’Ijipt pụta.
16 Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere emee ha n’agbanyeghị na ha dị ike.+
Ha ga-ekpuchi aka n’ọnụ ha.
Ntị ga-echikwa ha.
17 Ha ga-aracha ájá dị ka agwọ.+
Ha ga-esi ná mgbidi ha ndị siri ike mara jijiji pụta dị ka anụ na-arị arị.
Ha ga-amara jijiji bịakwute Jehova bụ́ Chineke anyị.
19 Ọ ga-emere anyị ebere ọzọ.+ Ọ ga-emeri mmehie* anyị.
Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile n’ala ala oké osimiri.+
20 Ị ga-egosi Jekọb na e kwesịrị ịtụkwasị gị obi,
Gosikwa Ebreham ịhụnanya,*
Otú ị ṅụụrụ nna nna anyị hà n’iyi n’oge ochie.+
Ọ bụ otú e si akpọbiri Maịkel (Maịkel pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?”) ma ọ bụ Mịkaya (Mịkaya pụtara “Ònye Dị Ka Jehova?”).
Mgbá aṅụ bụ ihe aṅụ na-anyụpụta nke na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ihe a na-agbaze ngwa ngwa.
Ma ọ bụ “Kpọọkwa ụgwọ niile a kwụrụ ya maka akwụna ọ na-agba ọkụ.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ Afra.”
Ma ọ bụ “ga-anapụ unu ihe niile unu nwere.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Na Hibru, “na-agaghị ewepụ olu unu na ya.”
Ma ọ bụ “Mmụọ Jehova ọ́ naghịzi enwe ndidi?”
Ma ọ bụ “ihe ndị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ite ọnụ ya dị obosara.”
Ma ọ bụ “ga-ekpuchi afụ ọnụ ha.”
Na Hibru, “ịwụfu ọbara.”
Na Hibru, “Ndị isi.”
Ma ọ bụ “n’erighị ngarị.”
Ma ọ bụ “ọlaọcha.”
Ma ọ bụ “ha na-asị na ha tụkwasịrị Jehova obi.”
Ma ọ bụ “kwuo ihe a ga-eme.”
Na Hibru, “ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha.”
Na Hibru, “ga na-ejegharị n’aha.”
Na Hibru, “ga na-ejegharị n’aha.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “Ada bụ́ Zayọn.”
Ma ọ bụ “ndị ndú.”
Na Hibru, “ka ịgba afa dị n’aka gị kwụsị.”
Ma ọ bụ “majik.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “maka mmehie mkpụrụ obi m mere?”
Ma ọ bụ “ka ị dị obiọma ma na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche.”
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “na-agụ mkpụrụ obi ya agụụ.”
Na Hibru, “wụfuo ọbara.”
Ma ọ bụ “ihe mkpụrụ obi ya chọrọ.”
Ma ọ bụ “M ga-enwe ndidi chere.”
Na Hibru, “N’ihi mkpụrụ ihe ha na-eme mịtara.”
Na Hibru, “gị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-azọda mmehie.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”