Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Maịka 1:1-7:20
  • Maịka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Maịka
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Maịka

MAỊKA

1 Ihe a ka Jehova gwara Maịka*+ onye Moreshet, n’oge Jotam,+ Ehaz,+ na Hezekaya+ bụ ndị eze Juda.+ Ọ gwara ya ihe a n’ọhụụ gbasara Sameria na Jeruselem:

 2 “Unu niile, geenụ ntị.

Ụwa na ihe jupụtara na ya, ṅaanụ ntị.

Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.

Nụrụnụ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-ekwu ihe unu mere.+

 3 N’ihi na Jehova si n’ebe o bi na-apụta.

Ọ ga-agbadata wee zọda ebe ndị dị elu n’ụwa.

 4 Ugwu niile ga-agbaze n’okpuru ụkwụ ya.+

Ndagwurugwu niile ga-agbawasị

Dị ka mgbá aṅụ* ọkụ gbazere,

Dị ka mmiri a wụpụrụ n’ebe kpọdara akpọda.

 5 Ọ bụ maka na Jekọb nupụrụ isi mere ihe a niile ji na-eme,

N’ihi mmehie ndị Izrel mere.+

Ole ndị mere Jekọb ji nupụ isi?

Ọ́ bụghị ndị bi na Sameria?+

Ole ndị mekwara e ji nwee ebe ndị dị elu na Juda?+

Ọ́ bụghị ndị bi na Jeruselem?

 6 M ga-eme ka Sameria bụrụzie obodo e bibiri ebibi nke dị n’ọhịa,

Ebe a na-akọ ubi vaịn.

M ga-awụba nkume ya na ndagwurugwu.

M ga-akụrikwa ntọala ya.

 7 A ga-akụri arụsị ya niile a pịrị apị,+

Kpọọkwa onyinye niile e ji kwụọ ya ụgwọ ọkụ.*+

M ga-ebibi arụsị ya niile.

N’ihi na o ji ihe ọ gbatara n’akwụna nweta ha.

A ga-ejikwa ha kwụọ ndị akwụna nọ ebe ọzọ ụgwọ.”

 8 M ga-ebe ákwá arịrị, tiekwa mkpu ákwá n’ihi ihe a.+

M ga-agba ụkwụ efu, gbarakwa ọtọ na-ejegharị.+

M ga na-eti mkpu dị ka nkịta ọhịa,

Na-erukwa uju dị ka enyí nnụnụ.

 9 N’ihi na ọnyá ya enweghị ike ịla ala.+

Ọnyá ahụ erutela Juda.+

O rutela n’ọnụ ụzọ ámá ndị m, rutekwa Jeruselem.+

10 “Unu akọla ya na Gat.

Unu ebela ákwá.

Tụrụọnụ n’ájá na Bet-afra.*

11 Ndị bi na Shefia, gbaranụ ọtọ jiri ihere si n’ala unu pụọ.

Ndị bi na Zeanan apụtabeghị.

Ndị Bet-izel ga na-eti mkpu arịrị. Ha agaghịzi enyere unu aka.

12 Ndị bi na Merọt na-eche ka ha nweta ihe ọma.

Ma, Jehova emeela ka ihe ọjọọ bịa n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.

13 Ndị bi na Lekish,+ kegidenụ ịnyịnya n’ụgbọ ịnyịnya.

Mmehie Zayọn mere si unu n’aka,

N’ihi na ọ bụ unu mere ka Izrel nupụ isi.+

14 N’ihi ya, unu ga-enye Moreshet-gat onyinye ọ ga-eji ala.

Ụlọ ndị dị n’Akzib+ rafuru ndị eze Izrel.

15 Ndị bi na Marisha,+ m ga-ezitere unu onye ga-emeri unu.*+

Ebube Izrel ga-eru Adọlam.+

16 Meenụ onwe unu isi nkwọcha ma kpụchapụ ntutu isi unu n’ihi ụmụ unu unu hụrụ n’anya.

Meenụ ka isi nkwọcha unu dị ka nke udele,

N’ihi na e si ebe unu nọ dọrọ ụmụ unu n’agha.”+

2 “Ndị na-akpa nkata ihe ọjọọ,

Ndị na-edina n’àkwà* ha eme atụmatụ otú ha ga-esi mee ihe na-adịghị mma, ga-ata ahụhụ.

Ha na-eme ihe ahụ ha kpara nkata ya mgbe chi bọrọ,

N’ihi na ha ga-emeli ya.+

 2 Ha chọọ inweta ubi, ha anara ya n’ike.+

Ha chọọ inweta ụlọ, ha eweghara ya.

Ha na-egwu mmadụ wayo nara ya ụlọ ya.+

Ha na-egwukwa mmadụ wayo nara ya ala ya.

 3 N’ihi ya, Jehova kwuru, sị:

‘M na-eme atụmatụ ka ọdachi dakwasị unu,+ ọdachi nke unu na-agaghị agbanahụ.*+

Unu agaghịzi adị mpako,+ n’ihi na ọ bụ oge ọdachi.+

 4 N’ụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-eji unu na-atụ ilu.

Ha ga-ebekwara unu ákwá arịrị.+

Ha ga-asị: “A laala anyị n’iyi.+

O nyere ndị ọzọ ala anyị ketara. Ọ napụla anyị ya.+

O nyere onye na-anaghị efe Chineke ubi anyị.”

 5 N’ihi ya, unu agaghị enwe onye ga-eji ụdọ na-atụ̀ ala,

Onye ga-ekere ọgbakọ Jehova ala.

 6 Ha na-asị, “Unu ekwusala ihe ọ bụla.

E kwesịghị ikwusa ihe ndị a.

A gaghị emenye anyị ihere.”

 7 Ndị si n’ezinụlọ Jekọb, ndị mmadụ hà na-ajụ, sị:

“Jehova ọ́ naghịzi enwe ndidi?*

Ọ̀ bụ ya mere ihe ndị a?”

Okwu m ọ́ naghị eme ka ihe gaziere ndị na-eme ihe ziri ezi?

 8 Ma n’oge na-adịbeghị anya, ndị m na-emezi ka ndị iro.

Ọ na-abụ, ha hụ ndị tụsaara ahụ́ na-agafe ka ndị si agha na-alọta,

Ha eyipụ ha ihe ndị dị oké ọnụ* e ji chọọ uwe ha mma.

 9 Ha na-achụpụ ụmụ nwaanyị ndị m n’ụlọ ha na-enwe obi ụtọ na ya.

Ha na-anapụ ụmụ ha ihe ndị m ji gọzie ha. Ha anaghịkwa enyeghachi ha ihe ndị ahụ ọzọ.

10 Bilienụ pụọ, maka na ebe a abụghị ebe a na-ezu ike.

N’ihi na ala a adịghị ọcha.+ E bibiela ya ezigbo mbibi.+

11 Ọ bụrụ na onye na-achụ ikuku, nke na-aghọkwa aghụghọ, aghaa ụgha, sị:

“M ga-agwa unu okwu banyere mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ na-aba n’anya,”

Ọ bụ ụdị onye a ka ndị a na-achọ ka ọ na-agwa ha okwu.+

12 Jekọb, m ga-akpọkọta unu niile.

O nweghị ihe ga-eme ka m ghara ịkpọkọta ndị Izrel fọdụrụnụ.+

M ga-eme ka ha dịrị n’otu dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ,

Dị ka ìgwè anụ nke nọ ebe ha na-ata ahịhịa.+

Ìgwè mmadụ ga na-eme mkpọtụ ebe ahụ.’+

13 Onye na-etipu mgbidi ga-ebutere ha ụzọ.

Ha ga-etipukwu mgbidi. Ha ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá gafere, sikwa na ya pụọ.+

Eze ha ga-ebutere ha ụzọ,

Jehova ga-abụkwa onyeisi ha.”+

3 M wee sị: “Ndị isi n’ezinụlọ Jekọb

Na ndị na-achị ndị Izrel,+ biko nụrụnụ.

Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịma ihe ziri ezi?

 2 Ma, unu kpọrọ ihe ọma asị,+ hụ ihe ọjọọ n’anya.+

Unu na-agba ndị m akpụkpọ, na-adọpụsịkwa anụ dị n’ọkpụkpụ ha.+

 3 Unu na-eri anụ ndị m,+

Na-agbakwa ha akpụkpọ,

Kụrie ọkpụkpụ ha, gwerisiekwa ha+

Dị ka ihe e ji ite* sie, dịkwa ka anụ dị n’ime ite e ji esi nri.

 4 N’oge ahụ, ha ga-akpọku Jehova ka o nyere ha aka,

Ma ọ gaghị aza ha.

Ọ ga-agbakụta ha azụ n’oge ahụ+

N’ihi ihe ọjọọ ndị ha na-eme.+

 5 Ndị amụma na-eme ka ndị m kpafuo.+ Ọ na-abụ ha nwee ihe ezé ha ga-ata,+ ha asị, ‘Udo dịrị unu.’+

Ma ọ bụrụ na mmadụ etinyeghị ihe n’ọnụ ha, ha alụso onye ahụ ọgụ.

N’ihi ya, Jehova gwara ndị amụma ahụ, sị:

 6 ‘Chi ga-ejinahụ unu.+ Unu agaghị ahụ ọhụụ.+

Naanị ọchịchịrị ka unu ga-ahụ. Unu agaghịzi agba afa.

Anyanwụ ga-ada n’ihi ndị amụma,

Chi ga-ejibidokwa ha.+

 7 Ihere ga-eme ndị na-ahụ ọhụụ,+

A ga-emechukwa ndị na-agba afa ihu.

Ha niile ga-ekpuchi ọnụ ha,*

N’ihi na Chineke azaghị ha ihe ọ bụla.’”

 8 Ma mmụọ Jehova emeela ka ezigbo ike dịrị n’ime m.

Ọ na-enyekwara m aka ka m na-ekpe ikpe ziri ezi, na-akatakwa obi,

Iji gwa Jekọb isi o nupụrụ, gwakwa Izrel mmehie ya.

 9 Biko nụrụnụ ihe a, ndị isi n’ezinụlọ Jekọb,

Na ndị na-achị ndị Izrel,+

Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ndị na-agbagọkwa ihe ọ bụla kwụ ọtọ,+

10 Ndị na-eji igbu mmadụ* arụ Zayọn, na-ejikwa ajọ omume arụ+ Jeruselem.

11 Ndị ndú* ya anaghị ekpe ikpe n’anaraghị aka azụ.*+

Ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ.+

Ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego.*+

Ma ha tụkwasịrị Jehova obi,* na-asị:

“Ọ̀ bụ na Jehova anọnyereghị anyị?+

Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+

12 N’ihi ya, a ga-eji maka unu

Kọọ Zayọn ka ubi.

Jeruselem ga-abụzi obodo e bibiri ebibi.+

Oké ọhịa ga-etochikwa ugwu nke ụlọ nsọ dị n’elu ya.+

4 N’oge ikpeazụ,

Ugwu nke ụlọ Jehova dị n’elu ya+

Ga-akwụsi ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile.

A ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile.

Ndị dị iche iche ga-enurukwa na-agbago na ya.+

 2 Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị:

“Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova,

Gbagookwa n’ụlọ Chineke Jekọb.+

Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya.

Anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”

N’ihi na a ga-esi na Zayọn nye iwu,*

Sikwa na Jeruselem kwuo ihe Jehova kwuru.

 3 Ọ ga-ekpere ọtụtụ ndị ikpe,+

Doziekwara mba ndị siri ike, ndị dị n’ebe dị anya, okwu ha.

Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,

Kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi.+

Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha.

Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.+

 4 Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya.+

E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ,+

N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha* ekwuola ya.

 5 N’ihi na ndị dị iche iche ga na-aza aha* chi ha.

Ma, anyịnwa ga na-aza aha* Jehova bụ́ Chineke anyị+ ruo mgbe niile ebighị ebi.

 6 Jehova kwuru, sị: “N’ụbọchị ahụ,

M ga-achịkọta ndị na-ete ụkwụ.

M ga-akpọkọta ndị a chụsasịrị achụsasị,+

Kpọkọtakwa ndị m mesiri ike.

 7 M ga-eme ka ndị ahụ na-ete ụkwụ fọdụ,+

Meekwa ka ndị ahụ a chịgara ebe dị anya bụrụ mba dị ike.+

Mụnwa bụ́ Jehova ga-esikwa n’Ugwu Zayọn na-achị ha,

Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.

 8 Ma gịnwa, ụlọ nche nke ndị na-azụ atụrụ,

Ugwu Zayọn,+

Ị ga-amaliteghachi ịchị n’alaeze mbụ,+

Alaeze nke dịbu na Jeruselem.+

 9 Gịnịzi mere i ji na-etisi mkpu ike?

Ọ̀ bụ na i nweghị eze,

Ka ọ̀ bụ na onye ndụmọdụ gị anwụọla,

Nke mere ahụ́ ji na-afụ gị ụfụ dị ka nwaanyị ime na-eme?+

10 Ndị bi na Zayọn, ahụ́ ga-afụ unu ụfụ, unu ga-etikwa mkpu ákwá

Dị ka nwaanyị ime na-eme,

N’ihi na unu ga-esi n’obodo pụọ gaa biri n’ọhịa.

Unu ga-erukwa Babịlọn.+

Ọ bụ ebe ahụ ka a ga-anapụta unu.+

Ọ bụ ebe ahụ ka Jehova ga-agbapụta unu n’aka ndị iro unu.+

11 A ga-achịkọta ọtụtụ mba ịlụso unu agha,

Ha ga-asị, ‘Ka e merụọ Zayọn,

Ka anya anyị hụkwa mgbe ihe a ga-eme ya.’

12 Ma, ha amaghị uche Jehova.

Ha aghọtaghịkwa nzube ya.

N’ihi na ọ ga-achịkọta ha dị ka ùkwù ọka* a ka gbutere egbute, nke e bu na-aga n’ebe a na-azọcha ọka.

13 Ndị bi na Zayọn,* bilienụ zọchaa mkpụrụ,+

N’ihi na m ga-agbanwe mpi unu ka ọ bụrụ ígwè.

M ga-agbanwekwa ọbụ ụkwụ unu ka ọ bụrụ ọla kọpa.

Unu ga-egwerikwa ọtụtụ ndị.+

Unu ga-enye Jehova uru ha ji aghụghọ rite,

Nyekwa Onyenwe ụwa niile akụ̀ ha.”+

5 “Ugbu a, unu ndị bi n’obodo a nọchibidoro anọchibido,

Unu na-ebekasị onwe unu ahụ́.

A nọchibidola anyị.+

Ha ga-akụ onyeikpe Izrel mkpara na ntì.+

 2 Ma gịnwa, Betlehem Efrata,+

Obodo kacha obere n’obodo ndị dị na Juda,

Ọ bụ na gị ka onye m ga-eme eze Izrel ga-esi pụta,+

Onye dịwara kemgbe oge ochie, kemgbe ọtụtụ afọ.

 3 N’ihi ya, Chineke ga-enyefe ha n’aka ndị iro ha

Ruo mgbe nwaanyị ime na-eme ga-amụ nwa.

Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị fọdụrụ ga-alọghachikwute ndị Izrel.

 4 Ọ ga-ebili ma jiri ike Jehova zụọ ha ka atụrụ,+

Jirikwa ebube nke aha Jehova bụ́ Chineke ya zụọ ha.

Ha ga-ebi ebe ahụ, ahụ́ eruokwa ha ala.+

Ọ ga-abụ onye ukwu n’ebe niile n’ụwa.+

 5 Ọ ga-eme ka udo dị.+

Ọ bụrụ na onye Asiria abata n’ala anyị zọda ụlọ elu anyị,+

Anyị ga-esi n’ụmụ mmadụ họpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi* asatọ ga-alụso ya ọgụ.

 6 Ha ga-eji mma agha lụso Asiria ọgụ,+

Lụsokwa Nimrọd+ ọgụ n’ebe ndị e si abanye ya.

Onye Asiria+ ahụ bata n’ala anyị ma zọọ ụkwụ na ya ịlụso anyị ọgụ,

Onye na-achị anyị ga-anapụta anyị n’aka ya.

 7 N’anya ọtụtụ ndị, ndị fọdụrụ n’ezinụlọ Jekọb

Ga-adị ka igirigi nke si n’ebe Jehova nọ.

Ha ga-adịkwa ka mmiri nke na-ezo n’elu ahịhịa,

Nke na-anaghị eche ka mmadụ gwa ya ihe ọ ga-eme,

Nke na-anaghịkwa echere ụmụ mmadụ.

 8 N’anya mba dị iche iche

Nakwa n’anya ọtụtụ ndị, ndị fọdụrụ n’ezinụlọ Jekọb

Ga-adị ka ọdụm nke nọ ebe anụ ọhịa ndị ọzọ nọ.

Ha ga-adịkwa ka ọdụm nọ ebe ìgwè atụrụ nọ,

Nke ọ na-abụ ọ na-agafe, ya ana-azọpịa ma na-adọri anụ ndị ọzọ.

E nweghịkwa onye na-anapụta ha.

 9 Unu ga-emeri ndị iro unu.

A ga-ebibikwa ndị iro unu niile.”

10 Jehova kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ,

M ga-ebibi ịnyịnya unu na ụgbọ ịnyịnya unu.

11 M ga-ebibi obodo ndị dị n’ala unu,

Kwatuokwa ebe niile unu rụsiri ike.

12 M ga-eme ka unu kwụsị ịgba afa,*

A gaghịkwa enwe onye ọ bụla n’ime unu nke na-eme anwansi.*+

13 M ga-ebibi arụsị unu a pịrị apị na ogidi unu.

Unu agaghịzi akpọrọ ihe unu ji aka unu rụọ isiala.+

14 M ga-efopụ ogwe osisi arụsị*+ niile unu,

Laakwa obodo unu niile n’iyi.

15 M ga-eji iwe na ọnụma kwụọ

Mba ndị na-erubereghị m isi ụgwọ.”

6 Biko, nụrụnụ ihe Jehova na-ekwu.

Bilienụ, zaranụ ọnụ unu n’ihu ugwu ukwu niile,

Ka ugwu nta niile nụkwa olu unu.+

 2 Ugwu niile, nụrụnụ ihe Jehova kwuru na e mere ya.

Ntọala ụwa nke siri ike, nụrụkwanụ,+

N’ihi na Jehova na ndị ya nwere okwu.

Nụrụnụ ihe ọ sị na ndị Izrel mere ya:+

 3 “Ndị m, gịnị ka m mere unu?

Oleekwa otú m si mee ka ike m gwụ unu?+

Kwuonụ ihe m mere unu.

 4 Esi m n’Ijipt kpọpụta unu.+

Agbapụtara m unu n’ala unu bụ ndị ohu.+

Eziteere m unu Mosis, Erọn, na Miriam.+

 5 Bikonụ, ndị m, chetanụ nkata Belak eze Moab kpara+

Nakwa ihe Belam nwa Biọ zara ya.+

Chetanụ ihe mere malite na Shitim+ ruo na Gilgal,+

Ka unu wee mara na Jehova na-eme ihe ziri ezi.”

 6 Olee ihe m ga-eji bịa n’ihu Jehova?

Olee ihe m ga-eji kpọọrọ Chineke nọ n’elu isiala?

M̀ ga-eji àjà a na-esucha ọkụ bịa n’ihu ya?

M̀ ga-eji ụmụ ehi gbara otu afọ bịa n’ihu ya?+

 7 Puku kwuru puku ebule ọ̀ ga-adị Jehova mma?

Mmanụ nke na-asọ ka iri puku kwuru iri puku iyi ọ̀ ga-adị ya mma?+

M̀ ga-enye ọkpara m maka isi m nupụrụ?

M̀ ga-enye mkpụrụ nke afọ m maka mmehie m?*+

 8 Gịnwa bụ́ mmadụ, Jehova agwala gị ihe dị mma.

Gịnịkwa ka ọ na-achọ n’aka gị?

Naanị ihe ọ chọrọ bụ ka ị na-ekpe ikpe ziri ezi,+ ka ị bụrụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi,*+

Nakwa ka i jiri obi umeala+ soro Chineke gị na-eje ije.+

 9 Olu Jehova na-akpọ obodo òkù.

Ndị nwere ezigbo amamihe ga-atụkwa egwu aha ya.

Nụrụnụ ihe mkpanaka na onye họpụtara ya na-ekwu.+

10 È nwere akụ̀ a kpatara otú na-adịghị mma

Ma ọ bụ efa* na-ezughị ezu, nke rụrụ arụ, ka dị n’ụlọ onye ajọ omume?

11 Aka m ọ̀ dị ọcha ma m nwee ihe na-adịghị mma e ji atụ̀ ihe

Na akpa nkume e ji atụ̀ ihe, nke e ji egwu wayo?+

12 N’ihi na ndị ya bara ọgaranya bụ ndị tigbuo zọgbuo.

Ndị bi n’obodo a na-aghakwa ụgha.+

Ire ha bụ aghụghọ aghụghọ.+

13 “N’ihi ya, m ga-eti gị ihe, merụọkwa gị ahụ́.+

M ga-eme ka ị tọgbọrọ chakoo n’ihi mmehie gị.

14 Ị ga-eri ihe ma afọ agaghị eju gị.

O nweghị ihe ga-adị gị n’afọ.+

O nweghị ebe ị ga-ebusa ngwongwo ị kwapụtara, ndị ọzọ aghara iburu ya.

M ga-enyefe ndị iro gị ngwongwo ị kwapụtara.

15 Ị ga-akụ mkpụrụ, ma ị gaghị aghọrọ ya.

Ị ga-azọcha mkpụrụ oliv, ma ị gaghị ete mmanụ ya.

Ị ga-emepụta mmanya ọhụrụ, ma ị gaghị aṅụ mmanya.+

16 N’ihi na unu na-eme ihe niile Ọmraị na ezinụlọ Ehab mere.+

Unu na-akpakwa àgwà otú ha kpara.

Ọ bụ ya mere m ga-eji mee obodo a ihe ọ ga-abụ, ndị mmadụ hụ ya, ya eju ha anya.

Ndị bi n’obodo a ga-abụkwa ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị.+

Ndị dị iche iche ga-akọchakwa ha.”+

7 Nke m agwụla. Adị m ka onye

Ghọrọ mkpụrụ osisi n’oge ọkọchị

Ma tụtụkọta mkpụrụ vaịn fọrọnụ mgbe e wechara ihe ubi,

Ma ọ hụghị ụyọkọ mkpụrụ vaịn ọ ga-aracha.

Ọ hụghịkwa mkpụrụ fig mbụ na-agụ ya agụụ.*

 2 Ezigbo mmadụ anọghịzi n’ụwa.

O nweghịkwa mmadụ ọ bụla na-eme ihe dị mma.+

Ha niile na-ezo ka ha gbuo mmadụ.*+

Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.

 3 Aka ha ma nnọọ otú e si eme ihe ọjọọ.+

Onyeisi na-ekwu ihe a ga-enye ya.

Onye na-ekpe ikpe na-ekwu ka a kwụọ ya ụgwọ.+

Onye a ma ama na-ekwukwa ihe ọ chọrọ ka e nye ya.*+

Ha na-agbakọkwa aka eme ya.

 4 Onye kacha mma n’ime ha yiri ogwu.

Onye kacha ha eme ihe dị mma dị njọ karịa ahịhịa ogwu e ji gbaa ogige.

Ụbọchị ndị nche gị kwuru gbasara ya, nke bụ́ ụbọchị a ga-ekpe gị ikpe, ga-eru.+

Ha agaghịkwa ama ihe ha ga-eme eme.+

 5 Unu atụkwasịla enyi unu obi.

Unu atụkwasịkwala enyi ọma unu obi.+

Agwala onye dina gị n’akụkụ ihe ị na-ezo ezo,

 6 N’ihi na nwa nwoke na-eleda nna ya anya.

Nwa nwaanyị na-emegide nne ya.+

Nwunye nwa na-emegidekwa nne di ya.+

Ndị ezinụlọ mmadụ bụ ndị iro ya.+

 7 Ma mụnwa ga na-ele anya Jehova.+

M ga-echere* Chineke, onye nzọpụta m.+

Chineke m ga-anụ olu m.+

 8 Onye iro m, aṅụrịla ọṅụ n’ihi ihe mere m.

Ọ bụ eziokwu na adaala m, m ga-ebili.

Ọ bụ eziokwu na m bi n’ọchịchịrị, Jehova ga-abụrụ m ìhè.

 9 M ga-edi iwe Jehova na-ewesa m

N’ihi na emehiela m ya.+

M ga na-edi ya ruo mgbe o kpechitere ọnụ m, kpeekwara m ikpe ziri ezi.

Ọ ga-akpọrọ m bịa n’ìhè.

M ga-elekwasị ezi omume ya anya.

10 Onye iro m ga-ahụ ya.

Ihere ga-emegbukwa onye jụrụ m, sị:

“Olee ebe Jehova Chineke gị nọ?”+

M ga na-ele onye iro m anya.

A ga na-azọ ya ụkwụ otú e si azọ apịtị dị n’okporo ámá.

11 Ọ ga-abụ ụbọchị a ga-eji nkume rụọ mgbidi gị.

N’ụbọchị ahụ, ị ga-enwekwu ala.

12 N’ụbọchị ahụ, ha ga-esi

N’Asiria na obodo ndị dị n’Ijipt bịakwute gị.

Ha ga-esi n’Ijipt ruo n’Osimiri Yufretis.

Ha ga-esi n’otu oké osimiri ruo n’oké osimiri ọzọ, sikwa n’otu ugwu ruo n’ugwu ọzọ.+

13 Ala a ga-aghọ ebe tọgbọ nkịtị n’ihi ndị bi na ya,

N’ihi ihe ha metara.*

14 Jiri mkpara gị zụọ ndị gị, bụ́ ìgwè atụrụ i ketara,+

Ndị naanị ha bi n’oké ọhịa, n’ebe a kụrụ mkpụrụ osisi dị iche iche.

Ka ha taa ahịhịa n’ala Beshan na Gilied+ otú ha tara n’oge ochie.

15 “M ga-egosi unu ihe ndị dị ebube+

Otú m gosiri unu n’ụbọchị unu si n’Ijipt pụta.

16 Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere emee ha n’agbanyeghị na ha dị ike.+

Ha ga-ekpuchi aka n’ọnụ ha.

Ntị ga-echikwa ha.

17 Ha ga-aracha ájá dị ka agwọ.+

Ha ga-esi ná mgbidi ha ndị siri ike mara jijiji pụta dị ka anụ na-arị arị.

Ha ga-amara jijiji bịakwute Jehova bụ́ Chineke anyị.

Ha ga-atụkwa ya* egwu.”+

18 Olee Chi dị ka gị,

Onye na-agbaghara mmehie+ nke ndị fọdụrụ n’Izrel bụ́ ndị ya?+

Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,

N’ihi na ịhụnanya* na-atọ ya ụtọ.+

19 Ọ ga-emere anyị ebere ọzọ.+ Ọ ga-emeri mmehie* anyị.

Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile n’ala ala oké osimiri.+

20 Ị ga-egosi Jekọb na e kwesịrị ịtụkwasị gị obi,

Gosikwa Ebreham ịhụnanya,*

Otú ị ṅụụrụ nna nna anyị hà n’iyi n’oge ochie.+

Ọ bụ otú e si akpọbiri Maịkel (Maịkel pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?”) ma ọ bụ Mịkaya (Mịkaya pụtara “Ònye Dị Ka Jehova?”).

Mgbá aṅụ bụ ihe aṅụ na-anyụpụta nke na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ihe a na-agbaze ngwa ngwa.

Ma ọ bụ “Kpọọkwa ụgwọ niile a kwụrụ ya maka akwụna ọ na-agba ọkụ.”

Ma ọ bụ “n’ụlọ Afra.”

Ma ọ bụ “ga-anapụ unu ihe niile unu nwere.”

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Na Hibru, “na-agaghị ewepụ olu unu na ya.”

Ma ọ bụ “Mmụọ Jehova ọ́ naghịzi enwe ndidi?”

Ma ọ bụ “ihe ndị pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “ite ọnụ ya dị obosara.”

Ma ọ bụ “ga-ekpuchi afụ ọnụ ha.”

Na Hibru, “ịwụfu ọbara.”

Na Hibru, “Ndị isi.”

Ma ọ bụ “n’erighị ngarị.”

Ma ọ bụ “ọlaọcha.”

Ma ọ bụ “ha na-asị na ha tụkwasịrị Jehova obi.”

Ma ọ bụ “kwuo ihe a ga-eme.”

Na Hibru, “ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha.”

Na Hibru, “ga na-ejegharị n’aha.”

Na Hibru, “ga na-ejegharị n’aha.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Na Hibru, “Ada bụ́ Zayọn.”

Ma ọ bụ “ndị ndú.”

Na Hibru, “ka ịgba afa dị n’aka gị kwụsị.”

Ma ọ bụ “majik.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “maka mmehie mkpụrụ obi m mere?”

Ma ọ bụ “ka ị dị obiọma ma na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche.”

Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “na-agụ mkpụrụ obi ya agụụ.”

Na Hibru, “wụfuo ọbara.”

Ma ọ bụ “ihe mkpụrụ obi ya chọrọ.”

Ma ọ bụ “M ga-enwe ndidi chere.”

Na Hibru, “N’ihi mkpụrụ ihe ha na-eme mịtara.”

Na Hibru, “gị.”

Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “Ọ ga-azọda mmehie.”

Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya